Psalms 148

Toonu Onyenwe ihe niile

1Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe,
toonu ya nʼebe niile kachasị elu.
2Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile,
toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.
3Toonu ya, anyanwụ na ọnwa
toonu ya, kpakpando niile.
4Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu
na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.

5Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,
nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.
6O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi;
o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.

7Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa,
unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,
8na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile,
na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,
9unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile
na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile
10na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile,
na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,
11ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche,
unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,
12ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ,
ndị okenye na ụmụntakịrị.

13Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,
nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu;
ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.
14O meela ka mpi
Mpi bụ ihe na-egosipụta ike, gụọ akwụkwọ 1Sa 2:1
ndị ya dị elu,
otuto ndị nsọ ya niile,
nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya.

Toonu Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU